Categories
Igbo Language Notes

Agumagu Odinala

NDINAYA:

                        Agumagu Odinaala

Agumagu odinaala bu ihe nna- nna anyi ha na-ekwuputa n’onu banyere echiche ha, ihe ha nuru nti ma o bu nke anya ha huru. okwu ndi a nwere ike buru: Akuko ifo, abu, ejije, ilu, agwugwa okwuntabiire, ukabuilu akukoneegwu.akuko

Ndi anyi ga-elebagodu anya n’ebe a bu akuko ifo,abu na ejije.

NDINISIOKWU:  (i)ufodu akuko ifo(ii) abu so ha na egwu ndi ozo(iii) ejije

Akuko ifo(Folktales)

NDINAYA

Akuko ifo bu akuko ndi gboo chikotara iji were na-enye nkuzi na nkowa banyere ndu anyi di, uwa anyi no n’ime ya, mmalite uwa na ihe di n’ime ya. Ndi Igbo na- ako akuko ifo iji mee onwe ha obi uto, nakwa ime ka mmadu nwee akonauche. iji maa atu, mgbe o bula mbe batara n’akuko ifo, ihe mmuta ga-adi nay a aghaghi ibu amamiihe n’ihi na Mbe nwekariri umuanumanu niile uche. ka anyi leba anya n’ufodu akuko ifo.

MBE NA EZI

Mbe na ezi gara oru otu oge.Ha ruchara oru ha nke oma.Onye kporo ha oru kwuru

a ugwo.Ka ha ruru ulo,Mbe kere ego ha were nke ya ma nyekwa Ezi nke ya.Mbe gara n’ihu biri Ezi ego nke ya.Ezi nyere ya ego ahu di ka enyi  ga – emere enyi ya.Ka abali  ano ruru,Ezi gara n’ulo Mbe maka ego ahu.Ma o hughi Mbe.O jiri iwe laa ubochi ahu.N’abali ano ozo Ezi gakwara n’ulo Mbe ,nani nwunye ya ka o huru.O huru okwute nwunye Mbe ji esu esu ogwu mana o maghi na okwute ahu bu Mbe.Ezi jiri iwe tufuo  okwute ahu.O teghi aka,Mbe esi n’ohia lobata hu enyi ya Ezi.Ezi nara Mbe ego ya ma Mbe siri ya buru uzo chota obere okwute ahu o tufuru n’ohia. Ezi were baa n’obere ohia di n’azu ulo Mbe na na-acho obere okwute ahu. O chogidere okwute ahu, o hughi yanozo wee ruo taa. O ka na-achogari okwute Mbe, nke gaeme ka Mbe kwughachi ya ego ya nke Mbe naara ya. Omuma ato bu

NWALE

i. Kedu ndi a na-akoro akuko ifo?

ii. N’akuko mbe na ezi, kedu onye bu onye aghugo?

Exit mobile version