Categories
Igbo Language Notes

OGUGU NA AGHOTAAZAA

NDINAYA

Aghotaazaa bu ajuju na aziza na-eso akuko o bula. Oge onye nkuzi na-akuzi ihe, o bu aghotaazaa ka a na-eme. Oge mmadu abuo na-akparita uka, o bu aghotaazaa ka ha na-eme dgz.  Na aka nke ozo, aghotaazaa bu ederede ahaziri nke oma dee ka aguo, ma zaa ajuju na-esote ya. Aghotaazaa abughi so naani ederede, nke e kwuru n’onu ma zaa ajuju na-estote ya bukwa aghotaazaa.

NDINISIOKWU: IHE OGUGU SI N’AKWUKWO

OGUGU NA AGHOTAAZA

Obi bu dinta, aha obodo ya bu Ihuoma.  Aha nkita ya bu Bingo.Obi nwere egbe nma na ube.Ihe ndia na-enyere ya aka na-ichu nta.Obi huru nchi abua Bingo were malite chuwa ha.Otagburu otu mgbe o nwudere ya.                                          

Zaa ajuju ndi a:

1.Kedu aha nwoke ahu (a) dinta (b) obi(c)nkita(d)bingo

2. Aha nkita ya bu ——- (a) obi (b)dinta(c)nkita (d)bingo

3. ——— na ——- na-enyere ya aka ichu nta (a) egbe,mma na ube(b)efere, ngaji   na aziza(c)oche, ulo na eku(d)aguba,mkpisi na eku

4.——— Bu aha obodo ya (a) onicha(b)enugwu(c)ihuoma(d)obi

5.——-nwudere nchi? (a) obi (b) nchi(c)bingo (d)nkita.

NDINISIOKWU: OGUGU NA AGHOTAAZAA GA N’IHU:  IHE OGUGU SI N’AKWUKWO

NDINAYA

Guo ederede a, ma zaa ajuju ndi na- esote ya

N’ezinaulo Udeozo, o nweghi onye na-ekwutekwa maka Afandu. O buladi nne ya na-abu oge o bula oto n’ariri, obi ya buzi okwute ugbu a. Udeozo n’onwe ya ekpebiela si: Afandu mara ebe o siri bia, ya laghachi, na ohi a dighi n’agburu ha, ka o na-adi be ndi ogo ya.

O gbajiri doro n’ogige ndi uwe ojii n’ogba ubochi Afo. Ndi jere afo ogba lotara na-ako na o nwere ndi ohi ano agbagburu dosa ha na nke ndi uwe ojii. A na-atamu si na ndi Obinagu so n’ime ha. Otutu mmadu wee gawa Ogba ka ha were anya ha hu. Tupu ha aloghachi, o bughizi ihe a na-ezo ezo na A fandu so na mmadu ano ahu. Udeozo, na nwunye ya, Erimma, anukwuola ya. Di ka ndi gara hu n’anya siri koo, naani Afandu bu onye Obinagu di ya. A maghi obodo ndi ozo si.

Zaa ajuju ndi a:

  1. Afandu bu: (a) onye uwe ojii (b) onye ohi (ch) onye oruugbo (d) onye ahia
  2. Ndi Obinagu a gbagburu di ole? (a) otu (b) abuo (ch) ato (d) ano
  3. Ebee ka ogige ndi uwe ojii di? (a) Obinagu (b) Afo Ogba (ch) Afo Obinagu (d) Ogba
  4. Erimma bu (a) Nwanne Afandu (b) Nne Afandu (ch) Enyi Afandu (d) Nwanne Udeozo
  5. Gini bu isiokwu akuko a?  (a) ihe mere ubochi afo (b) Udeozo na n’ezinaulo ya (ch) ndi ohi e gburu n’Ogba (d) Etu Afandu si laa mmuo.

 ORU ULO

Gugharia ederede a n’ulo

Exit mobile version