Categories
Igbo Language Notes

Ahuike ndi ntorobia -Nkowa maka ndi ntorobia, na mgbanwe n’ahu ndi ntorobia

                  Nkowa Maka Ndi Ntorobia

NDINAYA

Ndi ntorobia bu ndi gbara bido n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato.  A na- akpo nwaanyi zonyere ukwu n’afo ndi a nwa agboghobia, ma na- akpo onye nwoke nwa okorobia. Ma na ha zukota onu a kpoo ha ndi ntorobia.

Mgbanwe N’ahu Ndi Ntorobia

(i) Mgbanwe n’ahu umunwoke

Mgbe nwoke si na nwata puo wee banye na ntorobia, a ga-enwe mgbanwe di iche iche n’ahu ya, di ka: igba aji n’abu, igba aji n’ihe o jiri buru nwoke, igba afuonu na

igba aji n’obi. Olu ya ga na-adasi uda ike ma okwuo okwu. o ga na-etokwa ka ome ji n’ihi na o na- eri oke nri. o ga-ebido nwewe mmasi n’ebe umunwaanyi no. o ga na-adi ocha na-akpachapuru uwe o na-eyi anya.

(ii) Mgbanwe n’ahu umunwaanyi

O buru nwaanyi, oga-agbakwa aji n’abu, nakwa n’ihe o jiri buru nwaanyi. o ga-ebido ikpu ara. o ga-ebidokwa ihu nso ya n’onwa o bula. mgbe nke a na-eme onye ahu kwesiri ka akowara ya ihe mgbanwe ndi a putara na ndu ya di ka nwaanyi.

mgbanwe ndi ozo a ga-ahu n’ahu onye di etu a bu na ike ya na apata ukwu ya ga-ebido buwe ibu. akpupko ahu ya ga- na- akwo murumuru. o ga na-akpachapu anya wee na-eke ekike ka o wee na- adi mma ile anya. o ga na- etokwa oso oso.

NWALE

1. kedu ndi bu ndi ntorobia

2. Deputa mgbanwe opeka mpe ato a na-enwe n’ahu umunwoke

3. Deputa mgbanwe ato a na-enwe n’ahu umunwaanyi

ORU ULO

Deputa mgbanye ise i nwerela n’ahu gi di ka nwa ntorobia

NDINISIOKWUOria Ufodu Na-emetuta Ndi Ntorobia

NDINAYA

Oria ndi na- echere ndi ntorobia aka di otutu. Mana nke ha na-adabakari n’ime ya mgbe o bula bu oria mmeko nwoke na nwaanyi. ufodu oria a na-ebute site na mmeko nwoke na nwaanyi bu ndi a:

i. Gonoria

ii. Sifilis

iii. HIV/AIDS

Oria ndi ozo bu:

i. Iba

ii. Taifoid fiva

Uzo Mgbochi Oria Ndi a

Uzo di iche iche e nwere ike isi gbochie oria ndi a bu nke a

1. Gonoria: kwusi mmeko nwoke na nwaanyi

2. Sifilis: kwusi mmeko nwoke na nwaanyi

3. HIV/AIDS:  Gbara mmeko nwoke na nwaanyi oso tutu i luo nwaanyi ma o bu di.

4. Oria iba: E kwela ka mmiri na-ado aghara aghara n’okirikiri ebe ibi, kawa ahu na-ekpuchi mmiri I dowara n’ulo ekpuchi ka anwuta ghara ino n’ime ya mubaa, na-arahu n’ime neet, tupu i lakpo were aziza ulo piagbuo  anwuta febatara n’ime ulo, ma o bu igbaa ha ogwu anwu.

5. Taifoid fiva: O bu ijiji na- ekesa nje na-ebute oria a. O buru na ijiji ebee na nsi  ma o bu maamiri onye bu nje a wee bee na nri, onye riri nri ahu aghaghi ibute oria taifoid. Uzo ndi a ka e si egbochi oria taifoid:

i. A ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a nuo.

ii. A ga- achoputa ndi bu nje taifoid gwoo ha, ka ha ghara ibufe ya ndi ozo

iii. Ikwo aka nke oma mgbe o bula mmadu meturu onye na-aria taifoid aka

iv. Onye bu oria a na onye ebughi ya ekwesighi iji out iko na- anu mmiri.

v. Ha agaghi   ejikwa otu ngaji na out efere na-eri nri.

NWALE  

1. Deputa oria ndi nwere ike i metuta ndi ntorobia 

2. Deputa uzo niile e nwere ike isi gbochie oria ndi ahu

ORU ULO

  1. Ndi ntorobia bu ndi ————-  (a) gbara afo iri na abuo (b) gbara site n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato (c) gbara site n’afo iri ruo n’afo iri na asato (d) gbara afo iri na asato
  2. Otu n’ime ndi a esoghi na mgbanwe a na- enwe n’ahu umunwoke  (a) igba aji n’obi (b) igba afuonu (c) ikpu ara (d) igba aji n’abu
  3. O bu ———— na-ekesa nje na- ebute oria taifoid fiva   (a) ijiji (b) awuta (c) mmeko nwoke na nwaanyi (d) anwu
  4. A na- ebute otu n’ime oria ndi a site na mmeko nwoke na nwaanyi   (a) iba (b) taifoid fiva (c) HIV/AIDS (d) igbo agbo
  5. Otu n’ime ndi a esoghi na mgbanwe a na-ahu na ahu umunwaanyi   (a) igba aji n’abu  (b) ihu nso n’onwa (c) ikpu ara  (d) igba afuonu

Click here to ask a question and get an answer published in the forum. Read our disclaimer.

Get paid for every topic you create in: Shoutam.com Forum!MAKE-MONEY