Categories
Igbo Language Notes

NKENUDI AGUMAGU UGBU A

INDINISIOKWU: NGALABA AGUMAGU UGBU A

NDINAYA

Agumagu ugbu a bu echiche ndi gboo na ndi ugbua, ma obu ihe ha huru anya nke e deputara n’akwukwo. Aha ozo a na-akpo agumagu ugbua bu agumagu edeerede.Na mbu anaghi ede echiche ndi mbu n’akwukwo,ma n’oge ugbu a, a na- edezi ya n’akwukwo. N’oge mbu a na- akpo ya agumagu odinaala, mana n’oge ugbu a igu na ide akwukwo dizi, ya mere ana- edetuzi ya edetu n’akwukwo, ma na- akpo ya agumagu ederede. Akwukwo mbu e biputara n’asusu igbo bu omenuko, n’afo1933. Aha onye dere akwukwo a bu Pita Nwana. Kemgbe e dechara Omenuko, e deela otutu akwukwo n’asusu igbo.

NWALE

1.  Kowaa agumagu ugbu a

2. Gini bu aha akwukwo mbu e dere n’asusu igbo?

3. Gini bu aha onye dere akwukwo mbu n’asusu igbo?

ORU ULO

Gugharia ihe a muru taa

NDINISIOKWU: NGALABA AGUMAGU UGBU A

Agumagu ugbua nwere ngalaba ato. Ha bu:

1. Iduazi

2. Egwuruegwu/ Ejije

3. Abu

Iduazi

Iduazi bu akwukwo akuko. O na- abukari otu onye na-ede iduuazi. iduuazi e nwere n’igbo taa bu agutaonu n’ihe na e nweela otutu ndi ode aka ha na-agho nko.

Akwukwo ndi a bu ufodu iduazi e nwere:

  • Obiefuna nke F.C Ogbalu
  • Chinagorom nke nke Julie Onwuchekwa
  • Okpa aku Eri Eri nke Ude Odilora
  • Oja Dufuo Dike nke Ray C.Anene
  • Anu gbaa Ajo Oso nke Chinedum Ofomata
  • Uwa Mgbede nke S.N Okafo
  • Juo Obinna nke Tony Ubesie

(viii) Isi Akwu Dara N’ala nke Tony Ubesie

Egwuruegwu/Ejije

A kowaala ihe ejije bu n’isi nke asato. Di ka n’iduuazi e nweela otutu akwukwo n’ejije. Aga-edeputakwara gi ufodu n’ime ha, na ndi ode ha.

i. Okwe Agbaala nke Inno Nwadike

ii. Nwa Ngwii Puo Eze nke B.I.N Osuagwu

iii. Udo Ka Mma nke Anaelechi B. Chuklwuezi

iv. Nwata Rie Awo nke Goddy Onyekaonwu

v. Ojaadili nke Odunke

Vi. Obi Nwenne nke kalu okpi

Vii. Otu Mkpisiaka nke J.C Maduekwe

viii. Obidiya nke s. akoma

ix. Nwata Bulie Nna ya Elu nke Inno nwadike

x.   Omume Onye Na-Edu ya nke Inno nwadike

NWALE

1. Uzo ole ka ekewara agumagu ugbu a?

2. Deputa akwukwo ato bu (a) iduuazi (b) ejije

ORU ULO

Dee otu akwukwo Igbo ima site n’igbaso ihe ndi a:

1. Aha akwukwo

2. Aha ode

3. Afo ebiputara ya

4. Ulo oru biputara ya

5. O bu abu? Ejije?  Ka o bu Iduazi

Click here to ask a question and get an answer published in the forum. Read our disclaimer.

Get paid for every topic you create in: Shoutam.com Forum!MAKE-MONEY