Categories
Igbo Language Notes

Ikowa Ufodu Omenaala Igbo

Ndinisiokwu: Ufodu omenala gbasara umuakwukwo di ka (i) ikele ekele(ii) iga ozi (iii) irube isi dgz.

Omenala bu uzo ndi obodo o bula  di  iche  iche  si ebi ndu ha ka e ji mara ha. Di ka udi uwe ha na-eyi, udi nri ha na-eri, ma obu nkwenye di iche iche ha kwenyere. Ndi Hausa na-eyi agbada oge niile, nri ha bu tuwo. Nri ndi Igbo na- eyi abada. Nri ha bu ji na akpu. Nke a bu omenala ha.

Nihi ya omenala igbo bu uzo ndi igbo si ebi ndu ha di iche iche. Anyi  maara na ndi igbo bu ndi  na-eri nri akpu na ji.  Ha na-eme kwa emume di iche iche di ka ilu nwanyi, iwa oji ohuu, ikuputa nwa, iti mmonwu wdg.

https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/8/8b/Igbo_Cultural_Group_Performance.jpg/640px-Igbo_Cultural_Group_Performance.jpg

UFODU OMENAALA GBASARA UMUAKWUKWO

NDINAYA:

i. ikele ekele

ii. iga ozi

ii. irube isi

(i) Ikele ekele (Greeting)

Ekele bu uzo esi enye nsopuru.  O bu uzo di iche iche mmadu na ibe ya si enwe mmeko. Ekele so n’ihe ndi e ji mara ndi Igbo. Onweghi onye a naghi acho ekele. Ma o bughi  gi ka a na-ekele, o buru gi na-ekele mmadu. A na- ebido n’oge kuziwere nwata etu esi ekele ekele. Ndi Igbo nwere uzo di iche iche ha si ekele mmadu. Ekele ndi igbo e nwere bu:-

1. Iboola chi- Goodmorming

2. Ndeewo- weldone

3. Jisieike- weldone

4. ka chifo- Goodnight

5. Kaemesia- Goodbye

6. Daalu/imeela-Thank you

7. Ije oma- safe journey. dgz

(ii) Iga ozi

 Iga ozi bu oru nwata ketara n’ezinaulo. O bu ozi ka e ji azulite nwata. O nwere ike buru igara mmadu ibe gi ozi n’udi di iche iche. ozi diiiri nwata n’ezinaulo gunyere ndi a: iza ulo na ezi, ichu mmiri, ikpata nku, isachasi efere, isu akwa, iga gbute nri ewu, dgz

(iii) Irube isi

Irube isi bu njirimara nwata a zuru azu. Anyi elebala anya n’ikele ekele na iga ozi. Ihe ndi a bu onye na-erube isi nwere ike ime ha. Nwata anaghi erubere nne na nna ya, na ndi toro ya isi, o naghi erubere ndi nkuzi ya isi.

NWALE:

  1. Gini bu ekele ndi igbo?
  2. Deputa ekele di iche iche ndi igbo na-ekele.
  3. Kpoputa udi ozi ato i nwere ike I ga-n’ezinaulo
  4. Kedu njirimara nwata a zuru azu?

ORU ULO

Deputa ihe ndi a na-ekele ebe ndi a

i. Onye na-aru oru

ii. Onye na-eri nri……

iii. Onye na alakpu ura…..

iv. Onye na-aga nje m……

v. Onye obia………………

Ihe ogugu – Akwukwo maka junio sekondiri nta

Click here to ask a question and get an answer published in the forum. Read our disclaimer.

Get paid for every topic you create in: Shoutam.com Forum!MAKE-MONEY